Ịdọ aka ná ntị gbàsará ihe dị́ n’ime: akụkọ ná-esonụ nwerè isiokwu gbàsará mmerụ-ahụ onwe-onye na ịda mbà n’obi nke nwéré ike ịkpalite mmetụta ọjọọ n’obi ụfọdụ ndị mmadụ ná-ágụ́ ya.

Mgbe Alice dị afọ iri na isii, ọ dị ya ka ihe mgbu na mfù tinyerè ya n’ụlọ nga, ịda mbà n’obi na nnọpụ-iche wakpọ̀rọ̀ ya nke ukwuu.
Ka mmetụta nke enweghị olileanya nà-àrị́ elu na ndụ ya, otu abalị o kpebiri igbu onwe ya. Oge ahụ ka ihe a na-apụghị ịkọwa akọwa merè.
N’elu ọnụ ụlọ-elu o bi na ya, ifufè siri ike ferè na mberede nke mere ka ọ daba azụ n’ime ụlọ ya kama ịda n’ihu.
Ka o dina n’ala, n’obi ịma jijiji nakwà ná-èbé ákwá, Alice natarà ozi sitere n’aka onye agbata obi ya ná-akpọ ya òkù ka ọ bịa chọọchị. O kwetarà ịga, ebe ahụ kwa ka o bù ụ̀zọ̀ chọpụta Bible App.

Ọ maliterè ịgụ Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ, site na ya, o nwetarà olileanya ma wèré ndụ ya nyefee Jizọs.
Taa, Alice nà-èmepụtá ma ná-èbipụtá Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Nke Akwụkwọ Nsọ dị́ ka Onye Nrụkọ-Ọrụ YouVersion site n’otu app ahụ mere ka ọ mata Jizọs. Ọ bụghị naanị na olileanya jupụtarà ya n’obi — ọ nà-agbasakwa ya.
Ị̀ maarà onye nọ ná ndụ gị nke ọ dị ezigbote mkpa ịma Chineke? Gwa ha maka Bible App, ma rịọ Chineke ka O jupụta ha n’olileanya.



