Mgbe olileanya yìrì ka ihe ná-agaghị èkwé omume, Chineke zuterè Alice.

Alice-Story-Header-2026-11

Ịdọ aka ná ntị gbàsará ihe dị́ n’ime: akụkọ ná-esonụ nwerè isiokwu gbàsará mmerụ-ahụ onwe-onye na ịda mbà n’obi nke nwéré ike ịkpalite mmetụta ọjọọ n’obi ụfọdụ ndị mmadụ ná-ágụ́ ya.

Mgbe olileanya yìrì ka ihe ná-agaghị èkwé omume, Chineke zuterè Alice.

Mgbe Alice dị afọ iri na isii, ọ dị ya ka ihe mgbu na mfù tinyerè ya n’ụlọ nga, ịda mbà n’obi na nnọpụ-iche wakpọ̀rọ̀ ya nke ukwuu.

Ka mmetụta nke enweghị olileanya nà-àrị́ elu na ndụ ya, otu abalị o kpebiri igbu onwe ya. Oge ahụ ka ihe a na-apụghị ịkọwa akọwa merè.

N’elu ọnụ ụlọ-elu o bi na ya, ifufè siri ike ferè na mberede nke mere ka ọ daba azụ n’ime ụlọ ya kama ịda n’ihu.

Ka o dina n’ala, n’obi ịma jijiji nakwà ná-èbé ákwá, Alice natarà ozi sitere n’aka onye agbata obi ya ná-akpọ ya òkù ka ọ bịa chọọchị. O kwetarà ịga, ebe ahụ kwa ka o bù ụ̀zọ̀ chọpụta Bible App.

Mgbe olileanya yìrì ka ihe ná-agaghị èkwé omume, Chineke zuterè Alice.

Ọ maliterè ịgụ Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ, site na ya, o nwetarà olileanya ma wèré ndụ ya nyefee Jizọs.

Taa, Alice nà-èmepụtá ma ná-èbipụtá Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Nke Akwụkwọ Nsọ dị́ ka Onye Nrụkọ-Ọrụ YouVersion site n’otu app ahụ mere ka ọ mata Jizọs. Ọ bụghị naanị na olileanya jupụtarà ya n’obi — ọ nà-agbasakwa ya.

Ị̀ maarà onye nọ ná ndụ gị nke ọ dị ezigbote mkpa ịma Chineke? Gwa ha maka Bible App, ma rịọ Chineke ka O jupụta ha n’olileanya.

Share this post:

Ụmụ Ntakịrị nà-amalite ịhụ Okwu Chineke n’anya…

Ụmụ Ntakịrị nà-amalite ịhụ Okwu Chineke n’anya…

Mgbe Joshua garà mmemme Baịbụl maka ụmụaka, ọ chọtarà Ngwá Baịbụl Maka Ụmụaka. Ọ bụ̀ mgbe ahụ ka ihe niile gbanwerè.

A mụrụ ya n’ìsì, ọ chọpụtarà na ya nwerè ike ịnụrụ Okwu Chineke n’ụzọ dị́ mfe, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ maliterè ịhụ Baịbụl n’anya nke ukwuu.

Mgbe nna ya hụrụ ọṅụ mgbanwe dị́ n’ime nwa ya nwoke, ọ garà chọọchị wee nye Kraịst ndụ ya n’ụbọchị ahụ. N’oge na-adịghị anya, ezinụlọ ha dum nabatarà Jizọs.

Ugbu a, Joshua na ndị mụrụ ya nà-èjé ozi na chọọchị ha dị́ nso, ná-àgụ́kọ́ Baịbụl ọnụ kwa ụbọchị, ná-ènwekwá mmasị ịkọrọ ndị ọzọ bànyeré Ngwá Baịbụl Maka Ụmụaka.

Ị̀ chọrọ̀ ka ụmụaka ndị dị́ na ndụ gị hụ Okwu Chineke n’anya? Maka Ọnwa Baịbụl Zuru Ụwa Ọnụ, lekwasị anya na Ngwá Baịbụl Maka Ụmụaka, ma mee ka ụmụaka mata Okwu Chukwu site na akụkọ Akwụkwọ Nsọ nke ná-émé ka mmekọrịta dị́ mfe. ⬇️

Meghee Ngwá Baịbụl Maka Ụmụaka

Share this post:

Baịbụl Bụ̀ Maka Onye Ọ Bụla.

Mmadụ anọ nọ́ n'ebe dị́ iche iche gburugburu ụwa ná-ágụ́ Bible App na foonù ha.

Ndị Nrụkọ-Ọrụ anyị ná-ébipụtá Baịbụl nà-ènyeré anyị aka iji Okwu Chineke rute ndị mmadụ gburugburu ụwa.

YouVersion na ndị ná-ébipụtá Baịbụl nà-emekọrịta ihe nke ọma, bụ́ ndị ná-émé ka ederede ha dị akwughị ụgwọ, n’ime Bible App. Enwerè ihe karịrị asụsụ 2,400 na nsụgharị Baịbụl 3,800 na app ahụ—nke ọbụla nà-anọchite anya ọtụtụ mmadụ ná-arụsi ọrụ ike iji wètárá ọtụtụ mmadụ Okwu Chineke. Lee otù o sì arụ ọrụ…

Ndị Òtù Baịbụl Ná-Asụgharị Akwụkwọ Nsọ.

Ndị mbipụta ndị a nà-èjí ọtụtụ afọ ná-àsụgharị́ Baịbụl n’asụsụ ọhụrụ gasị iji wepụta ma mee ka Okwu Chineke dị́ ebe niile.

YouVersion nà-ènwetá édérédé Baịbụl ndị a akwụghị-ụgwọ.

Ndị Nrụkọ-Ọrụ anyị ná-ébipụtá Baịbụl nà-ènyé anyị nsụgharị ha n’akwụghị ụgwọ ka onye ọbụla wee nwee ike inweta ma gụọ Baịbụl.

Site na njikọta-aka anyị na ha, anyị nà-èruté ụwa niile.

Mgbe Onye Nrụkọ-Ọrụ Akwụkwọ Nsọ kenyerè anyị nsụgharị ọhụrụ, ọ nà-àdị́ maka ndị obodo anyị zuru ụwa ọnụ iji ya wee mee ihe n’ime nkeji ole na ole.

Mgbe mmadụ niile, ebe niile, nwerè ike isò Chineke kparịta ụka site n’Okwu Ya kwa ụbọchị, ndụ onye ọbụla gà-agbanwè. Ma ndụ gbanwere agbanwè nà-àgbanwè ụwa.

Taa, ka ị nà-àgụ́ Baịbụl gị, chee echiche bànyeré onye ọ dị mkpa inweta ahụmahụ nke ike Akwụkwọ Nsọ ná-ágbanwè ndụ. Mgbe ị mecharà nke ahụ, kekọrịtara ha Bible App!

Kekọrịta Ngwá Baịbụl

Ị̀ chọrọ̀ isò ndị n’enye anyị Nsụgharị Baịbụl dị́ iche iche kparịta ụka? Gị na Ndị Ná-Ébipụtá Baịbụl jikọọ ma sòró ha na Bible App ụbọchị taa.

Share this post:

Ị̀ dịla njikere maka Ọnwa BaỊbụl Zuru Ụwa Ọnụ?

Email-Header-starts-tomorrow

Mee Ememe Ọnwa Baịbụl Zuru Ụwa Ọnụ

Echi, ndị mmadụ gburugburu ụwa gà-esonyere gị ka ị nà-èmé Ihe-Ịma-Aka Baịbụl Dị́ Ụbọchị 30!

Okwu Chineke dị ike ịgbanwè ndụ. N’ọnwa a, olee otú ọ gà-èsí metụta ndụ gị? Ka anyị gosipụta obi ụtọ na atụmanya maka ihe Chineke gà-èmé n’ọnwa a.

Jìkéré maka Ọnwa Baịbụl Zuru Ụwa Ọnụ site n’ichekwa Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Dị́ Ụbọchị 30.

Chekwaa Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Share this post: