Daalụ maka isonyerè anyị na Ọnwa Eji Eme Ememe Akwụkwọ Nsọ Gburugburu Ụwa!

Daalụ maka isonyerè anyị na Ọnwa Eji Eme Ememe Akwụkwọ Nsọ Gburugburu Ụwa!

Ị tinyerè onwe gị n’ịgụ Okwu Chineke ruo ụbọchị iri atọ … , ọ bụghịkwa naanị gị merè ya.

Ị sonyeerè ihe karịrị mmadụ 3,000,000 ndị ná-ágụ́ Akwụkwọ Nsọ na Novemba a.

Otu n’ime ndị ahụ ị sonyeerè bụ̀ Pamela.

Ka ọ nà-ètó, Pamela nwerè ọtụtụ ihe-mgbu, ihe-mwute, na ajụjụ gbàsará onye ọ bụ̀. Ọ bụ̀ mgbe ahụ ka ọ tụgharịrị chee ihu na obi na Akwụkwọ Nsọ wee chọta Atụmatụ Ihe Ọgụgụ n’ékwú gbàsará ihe mmadụ bụ̀.

“Okwu Chineke gòsìrì m na Jizọs enyelarị m onye m bụ̀. Ọ bụ̀ naanị na m achọpụtabèghị ya. Eziokwu ahụ gbanwerè ihe niile.”

Pamela, MEXICO

Ọnwa Baịbụl Zuru Ụwa Ọnụ nwerè ike ịna àbịá ná njedebe, mana Okwu Chineke abụghị naanị maka otu sízn. E merè ya ka ọ bụrụ akụkụ nke ndụ gị kwa ụbọchị ka ị nà-èkwé ka Eziokwu gbanwee gị, dị nnọọ ka o sì gbanwee ndụ Pamela.

Ya merè, nọgide ná-àgá n’ihu! Nọgide ná mmekọrịta nke gị na Chineke site n’Okwu Ya, wee hụ ihe ọzọ Ọ gà èmé…

Mepee Bible App

Share this post:

This post is also available in: English Afrikaans Indonesian German Spanish Filipino (Tagalog) French Italian Dutch Portuguese, Brazil Romanian Russian Japanese Chinese (Simplified) Chinese (Traditional) Korean Arabic Belarusian Bengali Bulgarian Danish Finnish Greek Hebrew Hindi Hungarian Malay Mongolian Nepali Norwegian Bokmål Persian Polish Portuguese, Portugal Slovak Swahili Swedish Tamil Telugu Thai Turkish Ukrainian Urdu Vietnamese Zulu Czech Khmer Malayalam Spanish (Spain) Burmese Lithuanian Macedonian Burmese (Zawgyi) Serbian Armenian Icelandic Croatian Albanian Welsh Catalan Latvian Haitian Creole Shona Sorani Kurdish Xhosa Yoruba Slovenian